Full Lyrics
CHORUS
Chukwu nọ m nso oge nile
Chim nọ m nso oge nile
Atụl'egwu nwa Chineke
Onye nche gị mụ anya
Onye nche gị nọ nso oge nile
Kele ya tụọrọ ya mmamma
Na Chukwu nọ nso.
VERSE 1 (MALE VOICE)
Ka ugwu siri gbaa Jerusalem gburugburu,
Ka Chineke siri gbaa ụmụ ya ogige mgbe nile
Bịa nwannem k'anyi jee kele Chukwu
Na Chukwu nọ nso.
VERSE 2
Ezigbo onye nche atụrụ,
Ezigbo onye nche atụrụ
Ọ maara atụrụ ya
Atụrụ ya naanụkwolu ya
Chukwu nọ m nso mgbe nile
Bịa nwannem k'anyi jee kele Chukwu
Na Chukwu nọ nso.
VERSE 3
Onye nche gị mụ anya
Ọ naghị arahụkwa ụra
Nke ọ n'atụ oru ụra
Onye nchedo m ị nọ m nso
Bịa nwannem k'anyi jee kele Chukwu
Na Chukwu nọ nso.