Full Lyrics
REFRAIN
Chukwu Onye afọma anyị n'arịọ gị nị,
si nwanne anyị Florence Ewenike
na di ya bụ Emmanuel Nnagma
ndị jikọrọ nụ na Sacrament nke Matrimony dị asọ.
VERSE 1 (Female)
Nna nụrụ arịọ anyị,
Nna nụrụ ekpere anyị,
munye n'ime ha ọkụ nke ịhụnanya gị.
VERSE 2 (Male)
N'isi mbido k'imere ya
na nwoke g'ahapụ nne na nna ya
n'akwụrụ nwanyị ọzọ ha abụọ abụrụ otu.
VERSE 3 (Female)
Chukwu Nna biko lekwa ụmụ gị gọzie ha.
Kere onyinye nke ọmụmụ nwoke n'ọmụmụ nwanyị gọzie ha
jiri kpọọ onyinye nke akụ n'ụba wụyapụta akpa ha.
VERSE 4 (Male)
Nwoke cheta kwa n'ụgwọ i ji nwunye gị bụ ịhụnanya
nwunye g'asọpụrụ di ya hụbere y'isi
nwoke g'ahụ nwunye ya n'anya, nwanyị g'ahụkwa di ya n'anya
kudo nke Christi weel biri n'ime udo.