CHUKWU ONYE AFOMA by A. N. Oramasionwu — Lyrics

A. N. Oramasionwu Igbo Wedding Hymns Celebrations Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Chukwu Onye afọma anyị n'arịọ gị nị, si nwanne anyị Florence Ewenike na di ya bụ Emmanuel Nnagma ndị jikọrọ nụ na Sacrament nke Matrimony dị asọ. VERSE 1 (Female) Nna nụrụ arịọ anyị, Nna nụrụ ekpere anyị, munye n'ime ha ọkụ nke ịhụnanya gị. VERSE 2 (Male) N'isi mbido k'imere ya na nwoke g'ahapụ nne na nna ya n'akwụrụ nwanyị ọzọ ha abụọ abụrụ otu. VERSE 3 (Female) Chukwu Nna biko lekwa ụmụ gị gọzie ha. Kere onyinye nke ọmụmụ nwoke n'ọmụmụ nwanyị gọzie ha jiri kpọọ onyinye nke akụ n'ụba wụyapụta akpa ha. VERSE 4 (Male) Nwoke cheta kwa n'ụgwọ i ji nwunye gị bụ ịhụnanya nwunye g'asọpụrụ di ya hụbere y'isi nwoke g'ahụ nwunye ya n'anya, nwanyị g'ahụkwa di ya n'anya kudo nke Christi weel biri n'ime udo.

Download the sheet music

CHUKWU ONYE AFOMA

CHUKWU ONYE AFOMA

By A. N. Oramasionwu
Solfa
Igbo
1 page
1 Downloads
Wedding Hymns Celebrations
0 0

More lyrics you may want