Full Lyrics
REFRAIN
Chukwu dị mma, anyị bụ ụmụ gị a bịago, Chukwu anyị a bịago.
Anyị a bịago n'ihu gị, k'anyị nye gị otito kwesịrị gị.
Kpọkwazie isi ala nye gị, rịọkwa gị mgbaghara njọ a,
Ị bụ Chukwu dị ebere.
VERSE 1
Ọ naatọ m ụtọ ịbata na be gị,
Chineke m oo makana
Otu ụbọchị na be gị,
Ka mma karịa afọ kwuru afọ n'ebe ọzọ.
VERSE 2
Ebe a dị abụọ m ọ bụ karịa,
Chineke nọ n'ebe ahụ.
Chukwu ọma dị mma,
Lekwa ndị nke gị,
Gee ntị nụrụ ekpere anyị.
VERSE 3
Ịhụnanya n'ebere
Gaeso m n'ezie ụbọchị ndụ m niile.
Aga m ebi n'ụlọ nke onye nwe anyị,
Ebebe, ebebe, ebebe.