CHUKWU DI MMA by Johnpaul Chukwujekwu Okwor — Lyrics

Johnpaul Chukwujekwu Okwor Igbo Entrance songs Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Chukwu dị mma, anyị bụ ụmụ gị a bịago, Chukwu anyị a bịago. Anyị a bịago n'ihu gị, k'anyị nye gị otito kwesịrị gị. Kpọkwazie isi ala nye gị, rịọkwa gị mgbaghara njọ a, Ị bụ Chukwu dị ebere. VERSE 1 Ọ naatọ m ụtọ ịbata na be gị, Chineke m oo makana Otu ụbọchị na be gị, Ka mma karịa afọ kwuru afọ n'ebe ọzọ. VERSE 2 Ebe a dị abụọ m ọ bụ karịa, Chineke nọ n'ebe ahụ. Chukwu ọma dị mma, Lekwa ndị nke gị, Gee ntị nụrụ ekpere anyị. VERSE 3 Ịhụnanya n'ebere Gaeso m n'ezie ụbọchị ndụ m niile. Aga m ebi n'ụlọ nke onye nwe anyị, Ebebe, ebebe, ebebe.

Download the sheet music

CHUKWU DI MMA

CHUKWU DI MMA

By Johnpaul Chukwujekwu O...
Solfa
Igbo
2 pages
4 Downloads
Entrance songs Hymns
0 0

More lyrics you may want