Full Lyrics
INTRO
Bịa soro m ṅụrịa, bịa soro m gọrie, bịa soro m ṅụrịa.
REFRAIN
Ọṅụ dị n'eluigwe ma n'eluwa n'ihina Nna ezitego Kristi n'eluwa,
Ọkpar'Eze nkudo Ọ bịago
Igwe ndị Muozi nekwe otito dịrị Chineke n'elu kachaelu
Udo dịrị ndị obi ọma.
VERSE 1
Puku arọ ole gara aga k'onyamuma Aịzaya kwuru sị,
Nwata Vejin gaatụrụ ime
Imanuel, Onye nzọpụta.
VERSE 2
Na Judia, n'obodo Bethlehem,
Ka amụrụ Nwa ka nwa, Jesu Kristi.
Vejin Nne Ya were akwa fuchie Ya,
Nyibe Ya n'ihe eji enye anụ nri.
VERSE 3
N'etitị abalị ka ndị nche atụrụ n'eche anụ ha n'ime ọhịa,
Mmuozi wetara ha ozi nwa.
Ha ji ọsọ nije ruo na Bethlehem,
N'ụlọ anụ wee sekpuoro Ya.
VERSE 4
Ndị amamihe siri n'ọwụwa anyanwụ bịa,
Kpakpando dutere ha ka ha sekpuoro Ya.
Ha ji ọlaedo, frankinsens na mea
Ọk'onyinye a naenye eze.
VERSE 5
Ndị Muozi Chukwu n'ekwu okwu otito,
N'eto Chukwu na nzọpụta ụwa abịago.
Ha sị otito dịrị Chineke n'elu kachaelu,
N'ụwa udo dịrị ndị obi ọma.