Full Lyrics
REFRAIN
Chịọma mo! O yooyo Chi m Ọmalịcha Chi mo
Ọ dị mma naeme mma O nyinye bụ sọ mma ka m ji
salịsalị Chi naeme mma E bu m' onyinye
bịa n'ihu Gị sị Gị Nna: "Daalụ o! dịịrị m mma"
nar'ekele mo! nar'otito m jiri bịa
Chịọma mo! dịịrị m mma
VERSE 1
Ezi Chi m'ọma; Ọ rụa ka Gị nile ha naegos'ịhụnanya.
Maka ihe ahụ I meere m
O! abịara m ikele Gị Chịọma mo! dịịrị m mma
aeh! Chịọma
VERSE 2
Onye onyinye Chi dị mma
Chịọma Chi nọ m nso Oh! Chi naaza m'ekpere Chịọma
Ọgọgị bar'ụba ndụ mo! Ije Ọma I
naedu m n'o juru m'afọ Ngwa were m mebe k'o
siri masị gị Ebe ị bụ Chịọma mo! dịịrị m mma
aeh! Chịọma
VERSE 3
Ọ kwa Gị mere Onyeisi ọ hụb'ụzọ?
Ọ kwa Gị mere Onyeogbi o kwub'okwu?
Chịọma! Chukwuọma!
Ọ kwa Gị gar'ije n'elu mmiri I gboo ọgụ ọ dị ka ọ dị m fe
Ebe ọ bụ na mụ na Gị so aga;
N'ezie ụjọ agaghị atụ mo!
oh! Chịọma