CHIN'EMERE M by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Sacred songs Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] O n'emere m nma, O n'emere m nma nma, Ked' ihem g'enye ezi Nna mo, Ony' obi ọma. Agam ajaa Ya nma, Agam atụrụ Ya nma nma, Ihe Chinemere mo ọnụ m apụghị ịkọchasi. [CHORUS] Chinemere m nma n'eziokwu, Ị ma na Chineke Nna bụ Ya bụ Chinemere m ih'ọma. [VERSE 1] Ị nọjụ m onye nyere mu ndụ mo? Ndụ nk'ị dị onye nyere gị, Ahụike nk'ị nwere onye nyere gị ee? Oh. [VERSE 2] Ị neje aje ị n'abata, Ọ bụ onye n'echebe gị n'ihe mbarede? Ị n'ajụ m onye n'enye mu ahụike? Oh. [VERSE 3] Ọ bụ onye kere anyanwụ na ọnwa, Ma kee kpakpando nile dị n'eligwe? Ọ nyere mmadụ akọ uche na ihe nile nuju ee? Oh. [CODA] Nwannem so m kelee Chineke Nna, Bụ Ya bụ Chinemere m ih'ọma.

Download the sheet music

CHIN'EMERE M

CHIN'EMERE M

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
2 pages
3 Downloads
Offertory Hymns Hymns Sacred songs
0 0

More lyrics you may want