Chineke onye Mmamma by Udo Laurence Iwu — Lyrics

Udo Laurence Iwu Igbo Entrance songs Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

Mmamma mmamma mmamma... Chineke bunye mmamma, sọ Chineke bunye mmamma. Odogwu Odogwu k'ọ bụ, a gam aja ya mma. Ọ genile k'ọ naemere m o, mgbe m le k'ọ naemere mu mma. Chukwu n'echekwaba mu mmamma. Mma Chineke dị ndụ, k'anyị bulie aha ya elu eh. Maka n'ọ bunye mmamma. Bute egwu dị mma k'anyị gbawara ya egwu. Ọ nyema k'ọbụ ukwe mara mma k'anyị kwebere. Y'ukwe Odogwu k'ọbụ chima digheri ji n'ede ihe o neri. Egwu teberenu Chineke. Egwu ọhụrụ ka m g'agbara Chukwu onye dị mma. Ewo ka m g'agbara Chukwu onye dị mma. Ukwe dị mma ka m g'ekweberenu Chineke. Kwere Chukwu onye mara mma, mmamma zuru y'ahụ. Ọ mara mma, mma zuru y'ahụ. Odogwu n'agha tubenu ya. Nwanne otu nye ka a n'etu, ebube dike tubenu ya. Ọgaranya nwụm'ọ be aka n'akpụ nwa n'afọ. Kweere y'ukwoti to, ọ ji ọbara akpụ. Nwa bianye ya ihe dị mma. Kọwa ihe o mere m, kọwa ihe o mere m n'ime m. Kọwa kọwa ihe ọ naeme n'ime ndụ m. Kọwa ihe ọ naemere m o maka ọnụ m apụghị ịkọwa. Kọwa kọwa ọnụ m apụghị ịkọwa ya. Kọwa kọwa kọwa kọwa kọwa kọwa ya n'ezie. Ọ karị ka chi gaeji chi gaabọ. Ọnụ m apụghị ịkọwa kọwa kọwa kọwa. Chi gaeji chi gaabọ n'ezie. Leanya n'ihu m o, me leanya n'azụ m o. M buru onye ezi ọ n'aka nri, me leanya n'aka ekpe. REFRAIN Kwu a gam ahụ ihe m gaeji wee jaa Chineke mma. N'emere mu mma, a gam ahụ ihe m gaeji wee jaa Chineke mma. Utụtụ ehihie n'anyasị Chukwu. Kweberenu y'ukwe. A gam ahụ nwa hụ onyere muo mue teberenu y'egwu.

Download the sheet music

Chineke onye Mmamma

Chineke onye Mmamma

By Udo Laurence Iwu
Solfa
Igbo
6 pages
1 Downloads
Entrance songs Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want