Full Lyrics
VERSE 1
Agam' enye Chim ekele, ezi ekele;
Ekele n'ile m nwere bu nke Chim nyere m.
VERSE 2
Agam' enye Chim otito, ezi otito;
Otito n'ile m nwere bu nke Chim nyere m.
VERSE 3
Agam' enye Chim onyinye, ezi onyinye;
Onyinye n'ile m nwere bu nke Chim nyere m.
CHORUS
Chim di uto n'ezie, n'ezie,
Chim di uto.
VERSE 4
Chet' ihe oma Chineke mer' anyi o,
Chineke Nna, Ezi Nna.
VERSE 5
Chet' olu oma Chineke luru' anyi o,
Chineke Nna, Ezi Nna.
VERSE 6
Chet' afo oma Chineke mer' anyi o,
Chineke Nna, Ezi Nna.
CODA
O nyen' anyi ndu, Ezi ndu,
O nyen' anyi umu, Ezi umu,
Nyekw' anyi aku n'uba, Aku do.