CHIKWADO by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Chikwado! Ọ bụ ya Chukwu ọma, Nna doo! Ndị Gị abịarugo! Ka m n'etu Gị. Ih'ọma I n'emere m bar'ụba. Ngozi Gị n'echu m'ụra. A ga m ebur'ih'onyinye, Kporo ndị enyi m, nye Gị ekele, n'Ị dị nma. Ọ bụ onye dịka Gị, Chimar'obi mo, Chi n'akwado mo? [VERSE 1] Chineke, Onye so Gị bụ Dike! Onye ji Gị ji Ihe! Onye ahụ nwer'ihe nile! Ị zọpụtara m n'olulu ọnwụ, N'olulu aj'apịtị! Ị kwubara m n'elu okwute, Mee ukwu m ka o kwuru Chim! Chim! Chim! Chim! [VERSE 2] Chineke, Ị naazụ m ka atụrụ, Ewezuga Gị, Chineke, N'ime ndụ mo, ọ dịgh'ihe m pụr'ime. Odogwu n'eche mba nile! Ị ji mkpara Gị na ngụ Gị were nodebe m, Ọ bụ ha n'enye m'añụrị, Ọ bụ ha na akwado m. [VERSE 3] Anyị bịara k'anyị bunye Gị onyinye anyị; Onyiny'obi ọcha. Onyinye si n'ezi ala obi pụta, Onyinye mara nma, onyinye dị nsọ. Nara ha, ezi Chineke, Nara ha k'onyinye Abel. Nara, gọzie, Chukwu dị ndụ, Nanị Gị bụ Chi n'akwado mo!

Download the sheet music

CHIKWADO

CHIKWADO

By Jude Nnam
Staff & Solfa
Igbo
9 pages
4 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want