CHIDOZIE by Fr. Bart C. Ezeokafor — Lyrics

Fr. Bart C. Ezeokafor Igbo Communion Hymns Prayer Hymns Eucharistic songs Staff & Solfa notation

Full Lyrics

KỌRỌS Dozie! Dozie! Dozie! Chukwu dozie! Chukwu n'Ọririnsọ Ka ahụ na Ọbara Gị m naanata gbanwoo mo, saachaa mo! Ka ahụ na Ọbara Gị m naanata doo m nsọ O! m ka m dị ọcha, Onyendozi! VERSE 1 Ike agwụgo mo! Ike agwụgo mo! Ike agwụgo mo! imejọzi Gị Jeeso mo! Weerenu amara Gị jidesienụ m ike, Dozienụ m, ka m bụrụ nke Gị o! VERSE 2 Oteela m chọbara ka mụ na Gị dozie, ma ụtọ njọ ekweghị m kam kwụdosie ike, nyerenu m'aka kam mebe uche Gị, belatara m oliwarawara, oliwarawara nke njọ! VERSE 3 Mgbe ebilimmiri nkụwa naefegharị mo!, Mgbe ọnwụ nwa nk'ụwa na atụgharị mo, jidesienụ m'ike! jidesienụ m'ike ka m gharịda; Chukwu naedoz'ihe nile! AD LIB (SOP/TEN) Dozi! dozi! dozi! dozi! Chukwu dozie, mee m ka m mara Gị Olisa dozie ife naese r'anyị o! Dozienụ ndụ mo! nyenụ m ndụ ọhụrụ, Dozienụ ndụ mo! onye idozi ri nwee mgbanwe Ọkwa Gị doziri ndụ Meri Magdalin? Ọkwa Gị doziri ndụ nwanyị arụrụ ọbara? Zakiọsụ zutere Gị, nye ya nzọpụta Sọọlụ zutere Gị, ị gbanweere ya aha, nwanyị Sameria zutere Gị o! ị gbanweere ya ọnọdụ. Lezianụ mo, Chi mo! Lezianụ mo Chi mo! Dozienụ mo! O! Onyendozi! Dozienụ mo! O! Onyendozi! Onyendozi!

Download the sheet music

CHIDOZIE

CHIDOZIE

By Fr. Bart C. Ezeokafor
Staff & Solfa
Igbo
6 pages
8 Downloads
Communion Hymns Prayer Hymns Eucharistic songs
0 0

More lyrics you may want