Chibuzo by Nworie Collins Ifejika — Lyrics

Nworie Collins Ifejika Igbo Offertory Hymns Celebrations Hymns Sacred songs Staff & Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Nwannem, ka m gwa gị ihe merem ji aga n'ihu. Chi bụ ụzọm sooro wee nweta agam n'ihu. Enyim bịa ka ị hụrụ ụzọm sooro ọ dịwara m namma. Chi bụ ụzọm sooro wee nweta agam n'ihu. REFRAIN Sorom kelee Chi bụ ụzọ, eziokwu na ndụ. Ome ihe ukwu, O nyem gbakwuru wee nwere onwe muoh! K'anyi were egwu na abụ na onyinye nke dimma bịa n'eben so Ya. So mu kelee Ya na O merem ihe ọma eh! Chineke daalụ oh! Ọnụm bụ sọ ekele etu isiri wee gozie muoh. VERSE 1 Achọrọ m ụzọ n'elu, chọọ ya n'ala, chọọ ya n'ugwu nan dị da, oge ọ gbajuru doro, mana ọ dighi ebem hụrụ ụzọ. Mana kemgbem zutere Chineke, ọnọdụm gbanwee n'ụdị pụrụ iche. Lezie nụ kam si bụrụ akụkọ ịgba ama o rue bube Chukwu. VERSE 2 N'ime Chineke, ị ga enweta ngọzi n'uju. N'ime Chineke, ị ga enweta amara n'uju. N'ime ụzọ ahụ bụ Chineke, ị ga enweta ihe na akpa gị. Bịanụ soro Chi bụ ụzọ, k'unu kọwa pụta ịdịmma Ya. E sooro m Ya O wee gozie mu n'ụdị dị egwu.

Download the sheet music

Chibuzo

Chibuzo

By Nworie Collins Ifejika
Staff & Solfa
Igbo
4 pages
0 Downloads
Offertory Hymns Celebrations Hymns Sacred songs
0 0

More lyrics you may want