Full Lyrics
VERSE 1
Mmiri nke ndụ n'ezosike,
Ifufe nke ndụ n'efesike;
Ebuli mmiri na aghara
Juputara n'ebe nile n'ụwa.
VERSE 2
Ekwensu, dịka ọk'ọdụm,
Nke n'agbụja nke iwe dị;
N'ejegharị na ebe dum,
N'achọsike onye ọ g'elomi.
VERSE 3
Ndisi nk'ụwa na ndị dike,
Ndị d'akọ, na ndị maarihe;
Ndịa n'ezipụta onwe ha,
N'arụ ndị ọnọdụ ha dị ala.
VERSE 4
Biko, k'obim dị n'aka Gị,
K'ụzọm bụrụ nke I ziri;
Kam wee zoro na ndo nke Gị,
Ebe udo n'ọñụ zuroke dị.
CHORUS
Chebe m'o,
Chebe m'o,
Chebe m'o, Nna,
N'a m'amana njọ, Nna,
Chebe nwa I.