Full Lyrics
VERSE 1
Mmiri nke ndụ n'ezos'ike, Ifufe nke ndụ nefes'ike,
Ebili mmiri na aghara juputara n'ebe niile n'ụwa.
VERSE 2
Ekwesu dịka ọk'ọdụm, nke n'agb'uja nke iwe dị,
N'ejegharị na ebe dum, n'achọ sike onye ọg'elomi.
VERSE 3
Nd'isi nk'ụwa na ndị d'ike, ndị d'akọ, na ndị maar'ihe:
nd'a n'ezipụta onwe ha n'arụ ndị ọnọdụ ha dị n'ala.
VERSE 4
Biko, k'obim dị n'aka Gị, k'ụzọm buru nke I ziri,
ka'm wee zoro na ndo nke Gị, ebe udo n'ọñụ zur'oke dị.
CHORUS
Chebe m'o, chebe m'o, chebe m'o,
chebe nwa Gị, chebe m'o, Nna,
'na m'amana njọ, Nna, chebe nwa I.