Full Lyrics
CHORUS
Butere Chineke onyinye, onyinye, onyinye nyenụ
ya ekele, ekele, ekele nye ya otito,
otito, otito n'ụlọ nsọ ya n'ihi n'ọ bụ Chukwu.
Chukwu ọma.
VERSE 1
Butere Chineke onyinye gị
ụnụ ndị ọ gọziri agọzi
K'anyị jee n'ụlọ nsọ nye y'onyinye,
nye y'onyinye, n'ọ bụ Chukwu.
VERSE 2
K'anyị nyenụ Chineke ekele
kele ya n'ih'o mer'a karịka
K'anyị jee n'ụlọ nsọ nye y'ekele,
nye y'ekele, n'ọ bụ Chukwu.
VERSE 3
K'anyị nyenụ Chineke otito
K'anyị too ya otito kwesịrị aha ya
K'anyị jee n'ụlọ nsọ nye y'otito,
nye y'otito, n'ọ bụ Chukwu.