Full Lyrics
REFRAIN
Bute onyiny'obi ọcha,
bute onyinye mara mma,
onyinye siri n'ezi'obi gị pụta
mgb'obi gị dị ọcha,
buru ya bịa n'ihu Chineke.
VERSE 1
Ngozi Chukwu dị n'ụdị n'ụdị,
onyinye y'abak'ụba.
Ọ nwere ndị onyer'onyinye nk'akụ n'ụba,
nwe ndị oji r'onyiny'ọmụmụ gọzie.
Ụwa ezuoke nwannem o,
nk'ọ nyere gị nara,
rịọbanụ ya ma kwere
ọ g'agọzikwa gị.
VERSE 2
Onya'rịrịọ nọ n'ihu gị;
ị kụcha b'akpa chọb'ober'ego,
ọ kwa nke kach'obere,
Ị chezọgọ na Chukwu n'ele gị?
Ị sekpụrụ n'ihu Chineke
wee rịọ y'arịrịọ,
ọ sietuahu mee gị obi
ọ g'adịkwa gị mma?
VERSE 3
Ị bu mkpa gị nile wee bịa n'ụlọ nsọ Chukwu;
ọg'onyiny'erugo.
Ị nyocha b'akpa chọb'ober'ego!
Ọbụrụ na Chineke buru ngọzi ya bata
kee ya k'esi nyọ'onyinye,
ọ kw'ịta b'onwe gị ụta?