Onyinye Siri N'ezi Obi by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Bute onyiny'obi ọcha, bute onyinye mara mma, onyinye siri n'ezi'obi gị pụta mgb'obi gị dị ọcha, buru ya bịa n'ihu Chineke. VERSE 1 Ngozi Chukwu dị n'ụdị n'ụdị, onyinye y'abak'ụba. Ọ nwere ndị onyer'onyinye nk'akụ n'ụba, nwe ndị oji r'onyiny'ọmụmụ gọzie. Ụwa ezuoke nwannem o, nk'ọ nyere gị nara, rịọbanụ ya ma kwere ọ g'agọzikwa gị. VERSE 2 Onya'rịrịọ nọ n'ihu gị; ị kụcha b'akpa chọb'ober'ego, ọ kwa nke kach'obere, Ị chezọgọ na Chukwu n'ele gị? Ị sekpụrụ n'ihu Chineke wee rịọ y'arịrịọ, ọ sietuahu mee gị obi ọ g'adịkwa gị mma? VERSE 3 Ị bu mkpa gị nile wee bịa n'ụlọ nsọ Chukwu; ọg'onyiny'erugo. Ị nyocha b'akpa chọb'ober'ego! Ọbụrụ na Chineke buru ngọzi ya bata kee ya k'esi nyọ'onyinye, ọ kw'ịta b'onwe gị ụta?

Download the sheet music

Onyinye Siri N'ezi Obi

Onyinye Siri N'ezi Obi

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
2 pages
6 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want