BIANU NDI ENYIM NILE — Lyrics

Igbo Entrance songs Hymns Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Bianu, ndi enyim nile, Bianu, umu Chineke, Bia k'ayi nile were anuri chelu to Chineke ayi. O bu Ya kere madu, Me kwayi si n'okike, Ya bu k'ayi nile were obi zur'oke to Chuku. Biko were onu tonu Chuku, Tonu nu Chuku, Biko were onu tonu Chuku, Si Chineke o bu Chuku n'ezie. CHORUS N'ezie o bu Chuku n'ezie, O bu Chuku n'ezie, Nke ker' uwa n'igwe. Biko, wer' onu tonu Chuku, Si Chineke o bu Chuku n'ezie. VERSE 2 Chineke kere uwa, nara otito umu i; Nke na ji obi ak'ekele, naeti n'ebe nile; O bu I nwe otito ayi, Ngozi Gi bu kwa nk'ayi; Akpa na nsogbu nile nk'obi Gi gaegbopur'ay' ha nile. Biko, wer' onu janu Chuku, janu Chuku, janu Chuku; Biko wer' onu janu Chuku, si Chineke bu Chuku n'ezie. VERSE 3 Otito na nsopuru diri Ez'ayi Jisos; Nke ji obara di ok'onu gbaput'ayi n'ugwu Kalvari. I bu Nwa nke Jehova, buru kwa nwa nke Meri; Nwa nke Chuku, Nwa nke madu, Otito nile diri Gi. Biko wer' onu fenu Chuku, fenu Chuku, fenu Chuku; Biko wer' onu fenu Chuku, si Jehova bu Chuku n'ezie.

Download the sheet music

BIANU NDI ENYIM NILE

BIANU NDI ENYIM NILE

Solfa
Igbo
2 pages
3 Downloads
Entrance songs Hymns
0 0

More lyrics you may want