Full Lyrics
CHORUS
Bịanụ k'anyị kweere Dinwenu ukwe otito,
k'anyị kpọisi ala n'ihu Dinwenu Onye kere anyị,
maka n'ọbụ Dinwenu Chineke anyị.
VERSE 1
Bịanụ k'anyị kweere onyenwe anyị ukwe ọṅụ,
ka anyị tisie mkpu ike tijere nkume nke nzọpụta anyị,
ka anyị bịa n'ihu ya nye ya ekele,
were egwu na ukwe tobe ya.
VERSE 2
Bịanụ ka anyị fee onyenwe anyị, kpọọrọ ya isiala,
ka anyị sekpue n'ihu onyenwe anyị onye kere anyị
n'ihi na ọbụ Chineke anyị,
anyịnwa bụkwandị nke ya, igwe atụrụ ọ naazụ.
VERSE 3
Taa ọbụrụ na ụnụ anụ olu ya,
ụnụ akpọchila obi ụnụ dịk'ụnụ mere na Meribah na Masa
n'ime ọzara, mgbe Nnanna ụnụ ha nwalere m
ha nwalere m mana ha hụrụ akaọrụ m.