Full Lyrics
[Refrain]
Bia nara achịcha ndụ, nri Kristi nyere anyị.
Bia nara nri nyendụ, nke O nyere anyị.
Nri ndiọma, nri ndiọma.
Bia nara achịcha ndụ, nri nke ndụ,
N'oriri dị asọ, Ọ bụ nri ndiọma.
Chinek'anyị jikwa ndị nsọ Ya,
Bianụ nara achịcha.
Ahụ n'Ọbara Ya, bianụ nara n'iko nzọpụta.
[Verse 1]
Ọ bụ uche Chukwu na mmadụ niile gaenwe nzọpụta zuroke n'uju.
Sụ n'oriri nsọ, nwanne m kulie k'ị nara Dinwenu Onye nzọpụta anyị.
[Verse 2]
Bia nara ngọzi, ngọzi nk'udo.
Bianụ nara Kristi n'achịcha ndụ, nri n'eny' udo.
Nri n'eny' udo, bia nara Kristi Eze udo.
[Verse 3]
Nriọma, nriọma, nriọma, ngwa,
K'anyị jeenụ naranụ achịcha dị ndụ.
Achịcha Chineke ji echekwa ndị nke Ya.
Ndị ibu naanyịgbu bia nara Dinwenu.
Ndị a n'emegbu emegbu bia nara ntasi obi.
Ndị ọrịa niile bia nara ọgwụgwọ nsọ.
Nri ndị Mmụọzi riri wee nwe nnukwu aṅụlị.
Nriọma, nriọma, nriọma, ngwa,
K'anyị jeenụ naranụ achịcha dị ndụ.