Full Lyrics
INTRO
N'anya anyị bụ mmadụ, anyị gaara asị na oge ezubeghị.
Mana sọ Gị Oh Chineke
REFRAIN
maara ihe nile banyere nwa odibo Gị.
Anyị naarịọ ebere Gị n'isi ya.
Anyị naarịọ k'ihe Gị dị okpu chakwasị ya.
Anyị naarịọ ka nkasi obi ya bụrụ ala eze Gị dị okpu.
Were ezumike Gị dị ebighebi kwụọ ya ụgwọ.
VERSE 1
Ọnwụ onye otu Christi dị ụfụ rie nne.
Nhapụ o hapụrụ ndị nke ya naewute nke ukwuu.
Mana dị ka anyị si wee kwenye, ọ nwụghị anwụ;
kama a gbanwere ndụ ya.
VERSE 2
Leenu ka o siri fee Gị oge ọ dị ndụ.
Leenu ka o siri jeere Gị ozi n'ụwa.
N'ebere Gị dị ebighebi, enyochana adịghị ike ya;
site n'ihe ọma nile o mere kwụọ ya ụgwọ.
VERSE 3
Chukwu, na nwanne anyị gaabịa ịza òkù I kpọrọ ya
kita anyị chọsiri ya ike,
ka ọ masịzienụ Gị na nkasi obi anyị gaenwe
gaabụ site n'ihe nketa ya n'ihu Gị.