Anyi na-ario Ebere Gi... by Nworie Collins Ifejika — Lyrics

Nworie Collins Ifejika Igbo Burial / Funeral Hymns Prayer Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

INTRO N'anya anyị bụ mmadụ, anyị gaara asị na oge ezubeghị. Mana sọ Gị Oh Chineke REFRAIN maara ihe nile banyere nwa odibo Gị. Anyị naarịọ ebere Gị n'isi ya. Anyị naarịọ k'ihe Gị dị okpu chakwasị ya. Anyị naarịọ ka nkasi obi ya bụrụ ala eze Gị dị okpu. Were ezumike Gị dị ebighebi kwụọ ya ụgwọ. VERSE 1 Ọnwụ onye otu Christi dị ụfụ rie nne. Nhapụ o hapụrụ ndị nke ya naewute nke ukwuu. Mana dị ka anyị si wee kwenye, ọ nwụghị anwụ; kama a gbanwere ndụ ya. VERSE 2 Leenu ka o siri fee Gị oge ọ dị ndụ. Leenu ka o siri jeere Gị ozi n'ụwa. N'ebere Gị dị ebighebi, enyochana adịghị ike ya; site n'ihe ọma nile o mere kwụọ ya ụgwọ. VERSE 3 Chukwu, na nwanne anyị gaabịa ịza òkù I kpọrọ ya kita anyị chọsiri ya ike, ka ọ masịzienụ Gị na nkasi obi anyị gaenwe gaabụ site n'ihe nketa ya n'ihu Gị.

Download the sheet music

Anyi na-ario Ebere Gi...

Anyi na-ario Ebere Gi...

By Nworie Collins Ifejika
Staff & Solfa
Igbo
5 pages
3 Downloads
Burial / Funeral Hymns Prayer Hymns
0 0

More lyrics you may want