Full Lyrics
REFRAIN
Eh Anyị bịara abịa n'elu ụwa
Eh Eligwe bụ ebe obibi nke mmadụ
Eh Elu ụwa bụ oriri ka anyị pụtara
Onye nọjuru o were isi lewe anya n'igwe
VERSE 1
Gị bụ mmadụ ichezọgọ n'anyị bịara izu ahịa [All: n'elu ụwa]
Ichezọgọ n'ị bụ aja [All: mmadụ bụ aja]
Chetakwa na anyị zusi ahịa n'ụwa, anyị gaabịa n'ebe obibi anyị n'igwe.
VERSE 2
Gị bụ mmadụ ichezọgọ na ọ bụ Chukwu [All: nwe ụwa]
K'ichezọgọ na ihe nile dị n'ime ya [All: bụkwa nke ya]
Chetakwa na ihe nile ị naekpokọ n'elu ụwa, onweghị nke ị gaeji laa n'igwe.
VERSE 3
Gị bụ mmadụ ichezọgọ na Chukwu naahụ gị [All: mgbe dum]
K'ichezọgọ na ọ maara ihe nile [All: ị bu n'uche]
Matakwa na ezigbo ihe na nke ọjọọ ị mere gba ọtọ n'ihu Chukwu oge nile.
VERSE 4
Gị bụ mmadụ ichezọgọ na Chukwu gaajụ gị ike [All: maka ezi ihe]
K'ichezọgọ na ọ gaama gị ikpe, [All: maka ajọ ihe]
Chetakwa na mkpụrụ nke onye ọbụla kụrụ bụ ihe ọ gaaghọrọ n'ikpeazụ.
VERSE 5
Gị bụ mmadụ ichezọgọ na ajụjụ naeche gị [All: maka olu gị]
K'ichezọgọ na ahụhụ naeche gị [All: maka njọ gị]
Chetakwa na Chukwu gaeji ọnụma kpee ikpe maka ndị ndụ ọjọọ.
VERSE 6
Gị bụ mmadụ ichezọgọ na ọnwụ naeche gị [All: n'ọgwụgwụ ndụ gị]
K'ichezọgọ na ikpe naesote ya [All: n'ọgwụgwụ ndụ gị]
Chetakwa n'ọlịlị ka anyị bịara n'elu ụwa, anyị nọchaa anyị alaa n'igwe.