Full Lyrics
REFRAIN
Anyị abịawo Chineke, anyị abịawo Nna
Anyị abịaw'ikele Gị, gọzig'anyị Chukwu.
VERSE 1
Bịanụ ụmụ Chineke, k'anyị kelenu Nna
Bịanụ ndị kwere na Ọkpara Ya Jesu.
VERSE 2
Toonu Chineke Onye kere ụwa nile,
Toonụ Chineke Onye n'echekwaba anyị.
VERSE 3
Chukwu ebuka, Chukwu ebuka,
Ngọzi Ya karịrị akarị n'eb'anyị nọ,
Kele Ya, kele Ya, kelenu Chukwu.
VERSE 4
Gị bụ Nna nwekel'anyị m'ụtụtụ, m'ehihie,
Gị bụ Nna nwekel'anyị ma mgbede m'anyasị.