Full Lyrics
REFRAIN
Anyị abịawo Chineke, anyị abịawo Nna.
Anyị abịaw'ikele Gị, gọzig'anyị Chukwu.
VERSE 1
Bịanụ ụmụ Chineke,
Ka'nyị kelenụ Nna,
Bịanụ ndị kwere na
Ọkpara Ya Jesu.
VERSE 2
Toonụ Chineke
Onye kere ụwa nile,
Toonụ Chineke
Onye n'echekwaba ya.
VERSE 3
Chukwu ebuka,
Chukwu ebuka,
Ngọzi Ya karịrịa karị n'eb'anyị nọ,
Kele Ya, kele Ya,
Kelenụ Chukwu.
VERSE 4
Gị bụ Nna nwekel'anyị m'ụtụtụ, m'ehihie,
Gị bụ Nna nwek'el'anyị ma mgbede ma'nyasị.