Full Lyrics
[CHORUS]
Anyị abịama ne bee g' Chukwu.
Anyị abịama ne bee g' Nna.
Anyị abịama ne b'Eze Chiteoke.
Anyị abịama inye g' ekele,
Biko bịa nọkwir' anyị.
[VERSE 1]
Aṅụrị m ụyọ mgbe m nụr' ka ha n'as'
m'anyị jee g' de n' m'anyị jee me ne b'Onye nwe anyị.
Ụkwụ anyị kwụrụ ọtọ ne Jerusalem.
[VERSE 2]
Onye nwe anyị d' k'anyị gbakọta ma r'nta
ifee g' ofufe me olu anyị jekute g' n'ocheze g',
me ọb'anyị na amas' g'.
M'ọg' ne ụbọchị na a ne bee g' ka r'ma ụbọchị niile ne be ọzọ.
[VERSE 3]
Hụma ke ebe obibi g' dim oyi.
Nwa nke bee Chukwu jufụtar' n'ihu n'anya.
Hụma ke ebe obibi g' dim oyi.
Ọ na ag' mmụọ m ihu emoro g' Chukwu.
Hụma ke ebe obibi g' dim oyi.
Aṅụrị nke ga a d' gboo gboo.
Hụma ke ebe obibi g' dim oyi.
[LAST CHORUS]
Anyị abịama ne bee g' Chukwu.
Anyị abịama ne bee g' Nna.
Anyị abịama ne b'Eze Chiteoke.
Anyị ji ọb'aṅụrị wee bịa inye g' ekele,
Biko bịa nọkwir' anyị.