AMARACHUKWU (GOD'S GRACE) by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Echeela m ihu, chee azu, chee gburugburu. Olee ihe I jiri hu m n'anya karisia mmadu nile? Chukwu, ihunanya Gi n'atu m n'anya, obioma Gi n'eju m anya, ngozi Gi n'egosi m n'obu n'ihi amara REFRAIN Gi. Amara Gi eh, Chineke. Eh! Amara Gi eh, ka m ji aga. Eh! Amara Gi, ezi Chineke mo! Olee ihe m g'enye Gi, kwuo Gi ugwo amara Gi? Olaocha na Olaedo, onwegh' ihi ji h'eme, Chineke, maka n'obu Gi kere ha. Nar' onyinye m jiri bia, Chineke mo, n'obu Gi nwe ha. Amara Gi eh, ezi Chineke. Amara Gi eh! ozuworo mo! VERSE 1 M lee anya n'iru, lee anya n'azu, Oma m amasia masi! M lee anya gburugburu m o! Amara Gi! Site n'ubochi atur' ime m o, i ji amara kpuchite m o! Ihunanya Gi n'aru m o, n'agba m anya mmiri! Amara VERSE 2 Nria nria nile biara, laa. O bu amara Gi. Isi owuwa, afolulu, oyi omuma. Ukwu mgbu, eze mgbu, anya mgbu. Eke ker'uwa nar' ekele mo, doo! Amara bar'uba. Amara VERSE 3 M nwere ji n'ede, ezi Chineke, a ga m achita ha. M nwer' okuko, m nwer' ewu, a ga m akputa ya. Makan' amara Gi bar'uba n'ime ndu mo! I n'agozi m n'akwugh' ugwo, amara bar'uba. Amara

Download the sheet music

AMARACHUKWU (GOD'S GRACE)

AMARACHUKWU (GOD'S GRACE)

By Jude Nnam
Staff & Solfa
Igbo
12 pages
16 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want