Full Lyrics
INTRO
Echeela m ihu, chee azu, chee gburugburu.
Olee ihe I jiri hu m n'anya karisia mmadu nile? Chukwu,
ihunanya Gi n'atu m n'anya, obioma Gi n'eju m anya,
ngozi Gi n'egosi m n'obu n'ihi amara
REFRAIN
Gi. Amara Gi eh, Chineke.
Eh! Amara Gi eh, ka m ji aga.
Eh! Amara Gi, ezi Chineke mo!
Olee ihe m g'enye Gi, kwuo Gi ugwo amara Gi?
Olaocha na Olaedo,
onwegh' ihi ji h'eme, Chineke, maka n'obu Gi kere ha.
Nar' onyinye m jiri bia, Chineke mo, n'obu Gi nwe ha. Amara
Gi eh, ezi Chineke. Amara
Gi eh! ozuworo mo!
VERSE 1
M lee anya n'iru, lee anya n'azu,
Oma m amasia masi!
M lee anya gburugburu m o!
Amara Gi!
Site n'ubochi atur' ime m o,
i ji amara kpuchite m o!
Ihunanya Gi n'aru m o,
n'agba m anya mmiri! Amara
VERSE 2
Nria nria nile biara, laa.
O bu amara Gi.
Isi owuwa, afolulu, oyi omuma.
Ukwu mgbu, eze mgbu, anya mgbu.
Eke ker'uwa nar' ekele mo, doo!
Amara bar'uba. Amara
VERSE 3
M nwere ji n'ede, ezi Chineke,
a ga m achita ha.
M nwer' okuko, m nwer' ewu,
a ga m akputa ya.
Makan' amara Gi bar'uba
n'ime ndu mo!
I n'agozi m n'akwugh' ugwo,
amara bar'uba. Amara