Full Lyrics
CHORUS
Onye nwe anyị bilitere n'ọnwụ dị k'o siri kwuo
Alleluia naada n'ebe niile e,
Kristi emerigo ọnwụ, ọnwụ olee ebe ike gị dị?
Alleluia naada n'ebe niile e.
VERSE 1
Mmadụ nọbu n'ohu, ohu nke njọ
Mana ọnwụ Kristi wetere anyị mmeri na nzọpụta.
Ụwa n̄ụrịba, ụwa gọribe, kwebụ ukwe an̄ụrị.
Alleluia naada n'ebe niile e.
VERSE 2
Ọnwụ olee ike gị? Ọnwụ olee ụfụ gị?
Ọnwụ olee mmeri gị?
Ike k'ike abatago.
Nnukwu ihe emego n'ụwa, ụwa kwebụ ukwe an̄ụrị.
Alleluia naada n'ebe niile e.
VERSE 3
Onye mmeri ekunigo! K'anyị kelee ya!
K'anyị jaa ya mma maka n'ọ bụ dike.
Onye mmeri ekunigo! K'anyị kelee ya!
K'anyị jaa ya mma maka n'ọ bụ dike, bụ dike.