Full Lyrics
REFRAIN
Ngwanu, k'anyi jeenu kelee Nwa Chineke,
Emmanuel, Ez'udo.
Onye di ume ala.
Oke, Chukwu Nwa, nnoo!
Mgborogwu Devidi, bu Ya n'azoputa.
Kristi, abiago, anyi n'anuri.
Kristi, Nwa Chineke, Ez'amuru ohuru.
VERSE 1
Mgbe Josef na Meri rutelu Bethlehem,
n'ime abali, mgb'ime n'eme nwunye ya.
O wee gbaghariba, choghariba ebe o g'amu nwa.
Kpom, Kpom, n'ebe a! Ha juo ya, "Onye n'aku?"
O dighi mfe!
"O bu mo! Ime n'eme nwunye m!"
Ha si ya, "Mechikener'anyi uzo, jeken'e b'ozo, n'oyi n'atu, efe adighi ya chachaa!"
VERSE 2
Na mgbagwoju anya, Josef wee letipu anya.
O hu n'ebe ahu, ulo aruru maka umu anu.
Meri wee bee; O no n'ude, ihe mgbu omumu nwa.
Josef wer'oso n'ije gbagaba, rue n'ulo anu.
O kwadooro Meri eb'omumu nwa, wer'ahihia wee choo ya nma!
O kudatara nwunye ya.
A n'ekwu k'a n'ekwu, Meri amuo!
VERSE 3
Ebube Chukwu wee ju n'igwe.
Amamihe mmadu buzi nkiti.
I mana Chukwu Nwa aburugo mmadu n'ihi anyi.
Olu ifunanya!
O bu ih'omimi n'ezie, Olu ebube.
Ndi Muozi were mep'onu, were kweb'ukwe k'a n'anwunyu anya!
Otito diri Chukwu n'elu kach'elu,
n'uwa udo diri ndi mmadu, ndi nwere obi oma!