Full Lyrics
CHORUS
Aja nke elu obe!
Aja nke Altar b'otu ihe!
Maka n'ọ bụ Kristi n'onwe ya
Bụ Onye nchụaja
Bụrụkwa ihe 'ji achụ ya.
REFRAIN
N'elu obe ọ n'agba mmee
Ma n'ugbua n'altar dị nsọ
Zi site n'igbu iko nd'Ukochukwu
Ọ naghị agbazi mmee.
VERSE 1
N'oriri ikpeazụ
Ka Kristi dobere Eucharistia dị nsọ
Na ya ka O nyere iwu a
'Mebenu nke a na ncheta nkem o.
VERSE 2
Leenụ Onyenwe anyị
Ka O nọ n'altar Ukochukwu
Anyị kwenyere n'ezie
Na ọ bụ ụzọ nzọpụta anyị.
VERSE 3
Ka anyị sonye Kristi
N'aja nke Missa ọ bụ aja ka sị nsọ
N'ihi n'ọ bụ ụzọ
Anyị g'esi zute Nna n'ehigwe.
VERSE 4
Leenụ Chukwu nwa
Ka O si gbasa aka ya n'obe
Ọ nasị ndị njọ
Bịa nọrọnụ n'ọdụ Ọ kpụ.
VERSE 4B (SOLO CHANT)
Ihe omimi dị nsọ dị elu
N'igbu iko nd'Ukochukwu
Achịcha na mmanya ka n'erugharị
N'ọ g'adịdị nsọ site n'akụkọ Chukwu
Onye nọchiri anya Dinwenu anyị
Chunyere Chukwu aja dị akpụ
Nk' a naghị agbazi mmee
Ọ naghị agbazi mmee.