Full Lyrics
CHORUS
Ndị otu Kristi, k'anyị naba nụ o,
N'aja missa agwụsigo.
K'anyị gaba nụ o, gbasaa oziọma.
Oziọma eh, oziọma nke Chukwu.
Ozi nke udo.
K'anyị jeenụ na mba nile, ga gbasaa oziọma.
VERSE 1
Anyị bụ ihe nk'ụwa,
K'anyị jeenụ gosi pụta mba nile
Ihe n'eziokwu nke ala eze Chineke.
VERSE 2
Aja missa bụ aja ekele.
Aja anyị ji ekele Chukwu,
Onye hụrụ ụwa n'anya.
Onye jiri ọbara ya, ezi nwa atụrụ,
Were gbapụta anyị n'njọ,
Mee anyị ụmụ Chukwu,
Ada na ọkpara eze.
VERSE 3
Otito dịrị Chukwu, dịrị Chukwu Nna.
Otito dịrị Chukwu Nwa.
Otito dịrị Mmụọ Nsọ.
Ise.