Full Lyrics
VERSE 1
Abịaram n'ihu Gị Nna Chineke
Onye ebere biko nụrụ olu nwa Gị
N'asị lee m jigidem.
REFRAIN
Agbakwutem Gị Chineke, nkum'ebighiebi
Chebe mo Nna,
Atụkwasaram Gị obi
Chineke chekwabam.
VERSE 2
Enyema ka m dị na Gị Nna
Onye n'eche kwa mkpụrụ bím
Olil'anya m dị na Gị Nna
Lee m jigidem.
VERSE 3
Mgbe okifufe n'efe
Egwu dị n'ebe nile
Sọ Ngị bụ Onye ntasi obi
Biko Nna jigidem.
VERSE 4
Mgb'ọchịchị gbachir'ụzọ
Satan n'akpagharị n'ụwa
Sọ Ngị kam tụkwasar'obi
Biko Nna jigidem.