Agam Ebili by Sanctus Oleka — Lyrics

Sanctus Oleka Igbo Lenten Hymns Prayer Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Ewo ejehielam ụzọ Agam ebili eh laghachikwute gị Nna Ezi Nna mo [VERSE 1] Emehiewom gị Agam ebili eh laghachikwute gị Nna O Dinwenu ịnyochala obi mo Ọ n'enwutem n'obi na m n'emejọ gị Gosim ebere gị Nna dị ịhụnanya Agam echigha [VERSE 2] Chukwu emehiewom gị Naanị gị kam mejọrọ Onye nwem Ihe dị njọ n'ihu gị ka m mere Kwee ka m laghachikwute gị Achụpụkwalam n'ihu gị Anapụkwalam mmụọ nsọ gị Keny'obi dị ọcha nime mo [VERSE 3] Ajụlam ajụ Kwee ka m laghachikwute gị Meerem ebere gbataram os'enyemaka Nna Lee nwa gị anya njọ anyị gbukwala mo Ezi Nna gbaghara mo Nna Nabatanụ nwa gị biko Agam echigha Ta Nnam agam alaghachi Ewo laghachikwute gị Nna

Download the sheet music

Agam Ebili

Agam Ebili

By Sanctus Oleka
Staff & Solfa
Igbo
4 pages
12 Downloads
Lenten Hymns Prayer Hymns
0 0

More lyrics you may want