Full Lyrics
CHORUS
Aga m aga m, aga m eto gị O Chineke
N'ụlọ nsọ gị n'ihi n'ị zọpụtara m o.
VERSE 1
Aga m eto gị O Chineke n'ihi n'ị zọpụtala m
I kweghị ka ndị iro m merie m O Chineke ị zọpụtala m
N'ụla mmụọ, ọ bụ naanị m ka ị zọpụtara n'ọnwụ nwụrụ.
VERSE 2
Unu ndị niile kwụdosiri ike na Chineke kuo ọnụ egwu
Cheta nụ ịdị asọ ya kuo nụ egwu
Ma too nụ aha ya kuo nụ egwu.
VERSE 3
Iwe Chineke anaghị ete aka, amara ya n'adịgide
N'oge abalị ịkwa akwa n'adị, amara ya n'adịgide
Ma, ka chi bọrọ añụrị n'adị, amara ya n'adịgide.