Full Lyrics
[SOPRANO SOLO]
Ọ afụfụ mmụọ
Ọ afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
[TUTTI]
Ọ afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
Nene godu ka Jesu Kristi si we bịa n'ụwa
Ịba ọlụ dị mma
O ihu ifụnanya
Ọlụ Chukwu, O lue ebube
Ọnwụ n'elu obe
Ọ afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
[BARITONE SOLO]
Ma ọ gịnị ka Jesu melụ fa, fa jia chọya ka ọ nwụa
Ka ọ nwụa ọnwụ ifele n'elu obe
Ụmụnne m a jụa m o
Ọ bụzịkwa Jesu Kristi melụ ka ndị ngwụrọ wụba ụjọ n'jụlị?
Ọ bụzịkwo Jesu Kristi melụ ka ndị kpuru isị fụba ụzọ k'ugo?
Ọ bụzịkwo Jesu Kristi melụ ka ndị agụụ n'agụ riju afọ?
Ọ bụzịkwo Jesu Kristi melụ ka ndị nwụlụ anwụ, we kubekwa ume ndụ ọzọ?
Ma ọ gịnị k'ụmụ ụwa jili kwụa ya ụgwọ?
[CHORUS]
Ọnwụ Ọnwụ n'elu obe
Ọnwụ Ọnwụ n'elu obe
Ọ afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
[BARITONE SOLO CONTD]
Ọ fa echezọgo ka fa si tie Hosanna
Hosanna Hosanna Hosanna dịlị nwa David n'ebe dịlị eze ayị o
Kasienụ Hosanna Hosanna Hosanna ma na ọkwerọ izu fa etigharịa
[CHORUS]
Ọnwụ Ọnwụ n'elu obe
Ọ afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
[SOPRANO SOLO (WITH OBLIGATO CHORUS)]
Ọ afụfụ mmụọ
Ọ afụfụ mmụọ Jesu talụ anyị
N'egodu anya ka fa si bo ya ebubo
Ụfọdụ arị n'ọ naome alụ, n'ọsị na ụtụ a naatụ maka Caesar na o ziro ezi n'iwu n'ọbụ Ya bụ eze
Bụlụkwanta n'ihu Pilati asị na ya fụrọ ife o melụ dị njọ, ka ya dọa ya ọdụ mana fa ekwerọ ekwe fa asị...
[AGA M EKULICHORUS]
Aga m ekuli lachigha kwuru Nna m
[AGA M EKULIVERSE 1]
Nna biko, emehielam gị,
Megide elu megidekwa gị
[AGA M EKULIVERSE 2]
Etosighim ka akpọkwam nwa Gị,
Anam arịọ gị, gụnye m n'ụmụ odibo gị
[AGA M EKULIVERSE 3]
Emeghim ihe kwesịrị na m g'eme,
Ihe I sị mụ emena ka m mete
[AGA M EKULIVERSE 4]
Amam njọ m nke ọma ihe dị njọ n'ihu gị