Full Lyrics
[Soprano Solo]
Ahụhụ mmụọ
Ahụhụ mmụọ Jesu taara anyị
[Tutti]
Ahụhụ mmụọ Jesu taara anyị
N'egodu ka Jesu Kristi si we bịa n'ụwa
Ịlụ baara ọlụ dị mma
Chukwu oluebube
Ma ọ gịnị ka ụmụ ụwa ji kwụọ ya ụgwọ?
Ọnwụ n'elu obe
Ahụhụ mmụọ Jesu taara anyị
[Baritone Solo]
Ma ọ gịnị ka Jesu melu
Ka fa ji nchọ ya ka ọ nwụọ
Ọnwụ ifele n'elu obe
Ụmụnne m ajụọ m o
Ọ bụzịkwa Jesu Kristi melu ka ndị ngwụrọ wụba ujọ njọ lị?
Ọ bụzịkwo Jesu Kristi melu ka ndị kpuru isi fụha ụzọ k'ugo?
Ọ bụzịkwo Jesu Kristi melu ka ndị agụụ n'agụ lị ju afọ?
Ọ bụzịkwa Jesu Kristi melu ka ndị nwụrụ anwụ, we kubekwa ume ndụ ọzọ?
Ma ọ gịnị ka ụmụ ụwa ji kwụọ ya ụgwọ?
[Chorus]
Ọnwụ n'elu obe
[Baritone Solo Contd.]
Ọ fa echezọ ka fa si tie Hosanna
Nwa David n'ebe kachasị enu
Hosanna, Hosanna
Hosanna dịlị eze anyị o
Mana o kwero izu fa etigharịa
[Chorus]
Ọnwụ n'elu obe
Ahụhụ mmụọ Jesu taara anyị
[Soprano Solo]
Ahụhụ mmụọ
Ahụhụ mmụọ Jesu taara anyị
N'egodu anya ka fa si...