Full Lyrics
[REFRAIN]
Afụfụ Kristi, afụfụ Kristi,
afụfụ Kristi, afụfụ O
talu maka m o, afụfụ
na ọnwụ O here.
Uh...
[VERSE 1]
Na Getsemani nwute wutelu Kristi,
ọsụsọ mmee gbalụ Ya, O tie Nna biko!
Ọ bulu n'ọbu uche m o k'iko a gabiga m o,
mana k'uche Gi mee ezi Nna m o.
[VERSE 2]
A biara jide Ya dika onye oshi,
kpunu Ya pụta ndi nke Ya ahapụ Ya,
ekere Ya agbụ tie Y'ihe,
Onye n'enweghị ihe o mere,
man'ọdịrị ha ncha n'obi m o.
[VERSE 3]
Ha kpara okpueze kpube Ya n'isi,
ha mara Ya ụra gbukwaa Ya asụ,
ha ji Ya akpa ọchị ha n'akọcha Ya,
man'ọdịrị ha ncha n'obi m o.
[VERSE 4]
A mara Ya ikpe ọnwụ hapụ Onye ome njọ,
bo Y'obe di arọ wee jebe ikpọgbu Ya,
O dara ugboro atọ n'ụzọ bu sọ okwute,
man'ọdịrị ha ncha n'obi m o.
[VERSE 5]
A gbara Ya ọtọ kpọgide Ya n'obe,
n'etiti ndi oshi nye Ya mmanya gbara ụka,
ha n'akọcha Ya Onye aka Ya di ọcha,
man'ọdịrị ha ncha n'obi m o.