Afụfụ Kristi by Emma Orji — Lyrics

Emma Orji Igbo Lenten Hymns Holy Week Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Afụfụ Kristi, afụfụ Kristi, afụfụ Kristi, afụfụ O talu maka m o, afụfụ na ọnwụ O here. Uh... [VERSE 1] Na Getsemani nwute wutelu Kristi, ọsụsọ mmee gbalụ Ya, O tie Nna biko! Ọ bulu n'ọbu uche m o k'iko a gabiga m o, mana k'uche Gi mee ezi Nna m o. [VERSE 2] A biara jide Ya dika onye oshi, kpunu Ya pụta ndi nke Ya ahapụ Ya, ekere Ya agbụ tie Y'ihe, Onye n'enweghị ihe o mere, man'ọdịrị ha ncha n'obi m o. [VERSE 3] Ha kpara okpueze kpube Ya n'isi, ha mara Ya ụra gbukwaa Ya asụ, ha ji Ya akpa ọchị ha n'akọcha Ya, man'ọdịrị ha ncha n'obi m o. [VERSE 4] A mara Ya ikpe ọnwụ hapụ Onye ome njọ, bo Y'obe di arọ wee jebe ikpọgbu Ya, O dara ugboro atọ n'ụzọ bu sọ okwute, man'ọdịrị ha ncha n'obi m o. [VERSE 5] A gbara Ya ọtọ kpọgide Ya n'obe, n'etiti ndi oshi nye Ya mmanya gbara ụka, ha n'akọcha Ya Onye aka Ya di ọcha, man'ọdịrị ha ncha n'obi m o.

Download the sheet music

Afụfụ Kristi

Afụfụ Kristi

By Emma Orji
Solfa
Igbo
2 pages
2 Downloads
Lenten Hymns Holy Week Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want