ACHICHA DI NDU by Azuine-Uche Bruno — Lyrics

Azuine-Uche Bruno Igbo Communion Hymns Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Abụm achịcha dị ndụ, nri dị nsọ n'rịọma, achịcha dị ndụ n'rịọma si n'igwe, bịa nụ rie, bịa nụ ṅụọ, ka ị nwe ndụ n'ime Gi, ndụ ebighị ebi. VERSE ONE Abụm n'rịọma si n'igwe, nri n'enye ndụ ebighị ebi, n'rịọma si n'igwe, nri n'enye ndụ okpu, onye riri Ahụ mụ, onye ṅụrụ Ọbara mụ, g'ebiri n'ime m, m biri n'ime Gi. VERSE TWO N'anyasị ahụ eduru Ya nye n'ọnwụ, Jesu mere onwe Ya nnukwu ihe oriri, nnukwu ihe ọṅụṅụ, nye anyị sị anyị rie, sị anyị ṅụọ. VERSE THREE N'cheta nke m, Onye riri Ahụ mụ, ṅụọ Ọbara mụ, agaghị anwụ, wee ruo mgbe ebighị ebi, o g'ekulite, o gaekulite, na mbọsị ikpeazụ. VERSE FIVE Nara nụ m rie, nara nụ m ṅụọ, Ahụ n'Ọbara m n'enye ndụ ebighị ebi. Kulite jee nara rie, kulite jee nara ṅụọ, rie Ahụ mụ, a g'edunye mak'ihi unu, ṅụọ Ọbara mụ nke ọgbụgba ndụ ebighị ebi. Belụsọ m'ị riri Ya, belụsọ m'ị ṅụrụ Ya, ị gaghị enwe ndụ n'ime gị, ị gaghị enwe ndụ n'ime gị.

Download the sheet music

ACHICHA DI NDU

ACHICHA DI NDU

By Azuine-Uche Bruno
Staff & Solfa
Igbo
6 pages
1 Downloads
Communion Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want