ABUM ACHICHA DI NDU by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Communion Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Abụ m achịcha dị ndụ, Dinwenu n'ekwu, Abụ m achịcha dị ndụ si n'eligwe bịa, Abụ m achịcha dị ndụ, Nri n'enye ndụ n'ezie, Abụ m achịcha dị ndụ si n'eligwe bịa; Onye riri ahụ mo, Onye nụrụ ọbara mo g'adị ndụ n'ezie, Onye riri ahụ mo, Onye nụrụ ọbara mo g'adị ndụ okpu. [VERSE 1] Kristi ekwugo ya wee sị Beere sọ m'iri ahụ rị'ọbara Nwa nke mmadụ nụkwa ọbara Ya Beere sọ m'iri ya, nwannem m'iri ahụ mo, Beere sọ m'ịnụ ọbara m, ọbara dị oke ọnụ! Ị gaghị enwe ndụ n'ime gị! [VERSE 2] Abụ m achịcha dị ndụ n'enye ndụ ebigh'ebi, Abụ m achịcha dị ndụ Nna nyer'anyị, Bịanụ naranụ Kristi, Onye nwụrụ maka nyị, Bịanụ naranụ Kristi, Onye zọpụtar'anyị. [VERSE 3] Abụ m achịcha dị ndụ, Ndị otu Kristi, Abụ m achịcha dị ndụ. Kristi ekwugo, Abụ m achịcha dị ndụ. Naranụ m rie, Abụ m achịcha dị ndụ. Naranụ m ñụa, Abụ m achịcha dị ndụ. Nri n'enye ndụ, Abụ m achịcha dị ndụ. Nri si n'igwe, Abụ m achịcha dị ndụ. Achịcha mara mma, Abụ m achịcha dị ndụ. Achịcha dị nsọ, Abụ m achịcha dị ndụ. Rie nweta ndụ ebigh'ebi. Abụ m achịcha dị ndụ.

Download the sheet music

ABUM ACHICHA DI NDU

ABUM ACHICHA DI NDU

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
3 pages
40 Downloads
Communion Hymns Hymns
2 0

More lyrics you may want