ABỤ M ACHỊCHA DỊ NDỤ by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Communion Hymns Hymns Eucharistic songs Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Abụ m achịcha dị ndụ, Dinwenu n'ekwu, Abụ m achịcha dị ndụ si n'eligwe bịa, Abụ m achịcha dị ndụ, Nri n'enye ndụ n'ezie, Abụ m achịcha dị ndụ nke si n'eligwe bịa; Onye riri ahụ mọ, Onye riri ahụ mọ, ahụ mọ, Onye ṅụrụ ọbara mọ g'adị ndụ n'ezie, Onye riri ahụ mọ, Onye riri ahụ mọ, ahụ mọ, Onye ṅụrụ ọbara mọ g'adị ndụ ọkpụ. VERSE 1 Kristi ekwugo ya wee sị Beere sọ m'iri ahụ r'ọbara Nwa nke mmadụ ṅụkwa ọbara Ya Beere sọ m'iri ya, nwannem m'iri r'ahụ mọ, Beere sọ m'iṅụ Ya ọbara m, ọbara d'ọkụ a nụ! gaghị enwe ndụ n'ime gị. VERSE 2 Abụ m achịcha dị ndụ n'enye ndụ ebighị ebi, Abụ m achịcha dị ndụ Nna nyer'anyị, Bịanụ naranụ Kristi, Onye nwụrụ mak'anyị, Bịanụ naranụ Kristi, Onye zọpụtar'anyị. VERSE 3 Abụ m achịcha dị ndụ, Ndị otu Kristi Abụ m achịcha dị ndụ, Kristi ekwugo Abụ m achịcha dị ndụ, Naranụ m rie Abụ m achịcha dị ndụ, Naranụ m ṅụa Abụ m achịcha dị ndụ, Nri n'enye ndụ Abụ m achịcha dị ndụ, Nri si n'igwe Abụ m achịcha dị ndụ, Achịcha mara mma Abụ m achịcha dị ndụ, Achịcha dị nsọ Abụ m achịcha, Rie nweta ndụ ebighị ebi.

Download the sheet music

ABỤ M ACHỊCHA DỊ NDỤ

ABỤ M ACHỊCHA DỊ NDỤ

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
3 pages
27 Downloads
Communion Hymns Hymns Eucharistic songs
1 0

More lyrics you may want