Full Lyrics
CHORUS
Nara m abọ otito ma bunye m abọ ngozi Gị
Nara m abọ ekele ma bunye m abọ ngozi Gị
Chineke Nna, nara m abọ anyị
Nke m buru bịa n'ihu Gị biko doo Nna
Bunye m abọ ngozi Gị ka m buru laba
VERSE 1
Oge ruwo, o ruwo
Oge ruwo, o ruwo
Oge ruwo, o ruwo
Oge ruwo, o ruwo
O ruwo oge ruwo ka anyị ga n'ihu Chineke kelee Ya, too Ya
Abọ ngozi k'anyị g'eji nata
Abọ ekele k'anyị g'eji jee
Abọ ngozi k'anyị g'eji nata
Abọ anyị nye
Abọ ngozi k'anyị g'eji nata
Ị nụgo Nna
VERSE 2
Anyị g'eji ọñụ jee n'alta Chukwu too Ya kelee Ya nye Ya onyinye
Egwu dị mma k'anyị g'eji jee
Ngwa egwu ndị ma k'esi eti ịgba kutie nụ
E bu ịgba k'ị n'etie
Ọ bụ ọja k'ị n'egbuo
Ọ bụ une k'ị na akpọ
Kulite n'oge ruwo, a g'anyị g'eji egwu dị mma jee n'alta Chukwu too Ya kelee Ya nye Ya onyinye
Ị nụgo Nna
VERSE 3
Otito ekele ekele otito m nile
Otito ekele ekele otito m nile
Gaadịrị Gị mgbe dum
Ehihie mgbede anyasị, ụtụtụ ehihie mgbede anyasị
B'Ị nyere mu ndụ
Mgbe nile Ị nyere mu ndụ n'ahụ ike
Gọzie mu, nara nara mu
O ekele, otito ekele, ekele otito
Biko nara
N'ị bụ odogwu Eze kacha Eze