Full Lyrics
CHORUS
Anyị nụrụ ọnụ nwa, nwa bịar'ụwa nwa,
Ọnụ juputara n'igwe, ọnụ juru n'el'ụwa.
Mary mụrụ nwa ka nwa, Mary amụgonye nzọpụta.
Nweben'añụrị, Kristi abịago, nweben'añụrị.
Ụwa niile nụrịa, nweben'añụrị, nweben'añụrị.
Tibenụ mkpu ọnụ, ọnụ, nweben'añụrị, Kristi abịago, nweben'añụrị, nweben'añụrị.
Ụmụibe anyị nụrụ ọnụ nwa k'ọ n'ada na Betulehem, anyị dị ndụ e z'ito.
Anyị ruru Betulehem, anyị hụrụ Nne Maria,
Josef na nw'ọhụrụ, anyị nyere y'onyiny'ọla ọcha,
Mgb'isio mana mgbaịlụ, ọnụ juru n'el'ụwa ha n'ekwe Alleluia, alleluia,
Alleluia, Nwa Chine k'abịago.
VERSE 1
Isaiah buru amụma, Isaiah kwuru maka Ya,
Isaiah kwuru ya na nwagbọgh'atụr'ime.
O mezugo n'isi Maria, O mụrụ nwa ka nwa,
Mary mụrụ eze udo, Mary mụrụ odogwu,
Mụrụ ọbịajụlụ, Jesu Kristi nwa ka nwa ọbịago.
VERSE 2
Gwanụ mba niile na Kristi abịago,
Kwusabanụ oziọma, Messiah abịago.
Ez'a mụrụ maka ahụhụ, Ez'a mụrụ maka udo,
Onyenzọpụta ụwa niile.
Messiah nnọọ, Messiah nnọọ,
Kristi nnọọ, Messiah nnọọ,
Kristi nnọọ, Kristi nnọọ.
VERSE 3
Betulehem nke Judea obodo ọma,
K'anyị jeenụ zute Kristi nw'ọhụrụ na Betulehem nke Judea obodo ọma.
Ndị eze itọ jere nye Y'onyinye na Betulehem nke Judea obodo ọma.
Kpakpando nk'igwe bụ ya duru ha jee na Betulehem nke Judea obodo ọma.
Ndị otu Kristi kwadebenụ k'anyị jeenụ na Betulehem nke Judea obodo ọma.
K'anyị jee, k'anyị jee, k'anyị jee, k'anyị jee, k'anyị jee,
Nụ ih'ukwu mere na Betulehem.