Full Lyrics
REFRAIN
Nuriba na Chineke doo. Nuriba na Chineke gị eh!
Bịanụ k'anyị ṅụrịanụ, k'anyị ṅụrịanụ,
Nuriba na Chineke Nna, Onye ziter'anyị Nwa Ya.
N'ihi n'amụtal'anyị otu Nwa.
Bịanụ k'anyị ṅụrịanụ, k'anyị ṅụrịanụ,
N'ihi n'amụtal'anyị otu Nwa.
VERSE 1
Chukwu si n'eligwe bịa.
Ọ bịara n'ụdị mmadụ.
K'anyị kelenụ Chukwu Nna,
Onye ziter'anyị Nwa Ya.
VERSE 2
Chukwu si n'eligwe bịa,
Ilet'ụmụ Ya,
Onye dịka Chineke,
Onye ziter'anyị Nwa Ya.
VERSE 3
Mkpụrụobi m o!
Mkpụrụobi m o!
Nuriba na Chineke Gị,
Onye Nzọpụta Gị abịago.
VERSE 4
Ngọzi nke Chineke
Eruteg'ụwa nile.
Ngọzi nke Chineke,
Onye ziter'anyị Nwa Ya.
VERSE 5
Amara nke Chineke
Eruteg'ụmụ Y'aka.
Amara Ya zur'oke.
Amara Ya bar'ụba.
VERSE 6
Kelebenụ Chineke doo!
Onye amara, Ony'ukwu.
Kelebenụ Chineke doo,
Onye dị ebube, Ony'ọma.
VERSE 7
Tiberenụ Chineke egwu ọma!
Gbabaranụ Chineke egwu ọma!
Goribe na Chineke nwanne m,
Ịhụnanya Y'ebuka.