Full Lyrics
[BASS INTRO]
Chukwu Nna ekele, ekele, ekele n'otito dịrị gị, Chineke Nna.
[TENOR]
Odogwu Odogwu bụ Ony'okwubube.
Anyị na ekele gị Chukwu Chineke,
meeta ebe o masịrị gị n'anyị g'adị ndụ hu oluebube gị.
[CHORUS]
Ekele, ekele, ekele, ekele n'otito dịrị gị.
K'anyị nyenụ Chukwu anyị ekele.
Chineke Odogwu, Odogwu.
K'anyị bịa Chukwu ekele oh.
Ọha bịarịje nnọọ nụ, nnọọ nụ, nnọọ nụ, nnọọ nụ.
Ọha bịarịje ekele, nnukwu ihe ọn̄ụ emego.
[SOP / TENOR]
Arch Bishop anyị ekele, Most Rev. Dr Valerian Mmaduka Okeke.
Nnukwu Onye nche atụrụ, Abụba Nna ụmụ gị n'ekele gị.
Ndị ụkọchukwu anyị ekele ụnụ.
Rev. sisters ekele ụnụ.
Ndị catechist anyị ekele.
Parishioners ekele, ekele.
Ekele anyị n'agalu Parish Priest anyị, aka meere azụ mgba ku,
Rev. Fr Celestine Anioforo, o chi wara anyị ekele gio.
Aka anyị dị n'elu, ọtọlgologo ndụ k'anyị naarịọ n'isi ndị ụkọchukwu.
Chineke imeela ebe o masịrị gị n'anyị g'adị ndụ.
Kedu na ndị parish anyị, nche hu ebe doro ụlọ ụka anyị nsọ,
bu St Peter de Apostle parish,
Ugbwugba na ndị ofu Kristi nile bi n'ime ya.
Anyị n'arịọ Chineke, biko mee ka ndị nile n'ekpere gị
ma n'efe gị ofufe n'ime ụlọ nsọ ya,
nweta dim asọ, nweta dim asọ, nweta dim asọ zuru oke n'ime ha.
Ma kwesi ekwesi ị bunyere gị, ṅan̄ụrị dị ebebe n'eligwe.
Amen. Sing praise to the Lord, Amen.