VENITE by D. M. Okongwu — Lyrics

D. M. Okongwu Igbo Entrance songs Anthems Responsorial Psalms Solfa notation

Full Lyrics

CANTOR I (BASS) Bịa nụ k'anyị tikusie Jehova mkpu ọṅụ, K'anyị tikusi' oke nkume nke nzọpụt'anyị mkpu ọṅụ ike. ANTIPHON N'ihi na Chineke ukwu ka Jehova bụ, Ọ bụkwa Eze ukwu n'achị chi nile. Ọ bụkwa Eze ukwu n'achị chi nile. NO 2 DUET K'anyị were ekele bịa n'ihu Ya, K'anyị wer' abụ ọma tikusie Ya mkpu ọṅụ ike. NO 3 BASS Ony' ebe nile nke michasịr' emi nk'ụwa dị n'aka Ya, Ebe dịchasị elu nk'ugwu nile bụkwa nke Ya. NO 4 TRIO (S.T.B) Onye nwer' okesimiri, Y'onwe Ya mekwara Ya, Ọ bụkwa aka Ya kpuru ala akọrọ. NO 5 S.A.B. Bata nụ k'anyị kpọọ isi ala ruru kw'ala, K'anyị gbue ikpere n'ala n'ihu Jehova Onye mewor' anyị. NO 6 SOP. N'ihi na Y'onwe Ya bụ Chinek'anyị, Anyị onwe anyị bụkwa ndị Ọ naazụ dị k'atụrụ, Bụrụkw' igwe atụrụ nke aka Ya. VARIATION Taa Ọ bụrụ n'unu ege ntị olu Ya, Unu emena ka obi unu sie ike, Unu emena ka obi unu sie ike.

Download the sheet music

VENITE

VENITE

By D. M. Okongwu
Solfa
Igbo
2 pages
15 Downloads
Entrance songs Anthems Responsorial Psalms
0 0

More lyrics you may want