Full Lyrics
CHORUS
Uzo Nna m o,
Uzo Nna m o,
Uzo Nna a chorom isoro Uzo Nna m o.
Na ndum niine n'ihina Uzo Nna bu amamihe,
Uzo Nna bu idiocha.
Chineke nyem amara gi,
Kam soro uzo gi.
VERSE 1
Jesu Kristi Dinwenum onye churu aja fun'anya n'enu obe,
Emego kam buru Nwa nke Chineke, buru kwa
Onye n'eso uzo Ya site n'omume.
Jesu bia biri n'imem, gosi m uzo gi.
VERSE 2
Jesu kwuru si "A bum uzo, Eziokwu ma buru kwa Ndu,
Ony'obuna g'esoro Mu g'enwe ife nke ndu."
O sikwa gi wer' ifunanya mmadu ibe gi we efee Ya.
VERSE 3
Ekwerem o! Ekwerem o!
Chukwu nyerem aka,
N'agam asopuru uzo Nna Nso,
Ka uzo ya di otu obu n'osiri di.
Jesu bia gosi m uzo.