Uwa Mmebi by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Lenten Hymns Prayer Solfa notation

Full Lyrics

Ihe isike, ọ karịala! Ewo, agụụ Oti nwata dịrị nne ya Ọ gịnị k'anyị g'eme o! Chineke zọba nyi maka na onye agụụ naagụ n'ewe iwe ọkụ ngwa ngwa. Ọ bụrụ mgbe anyị nọ n'agha, Ọ garị ekwe nyi omume maka n'ebere Chukwu gbabulu ụzọ n'edu anyị! Dị k'o siri mee mgbe anyị lụrụ agha Biafra Afọ gisi titi to ghari nwụchasi Ọ bụ nanị agụụ ka a dọrịa? Mba! Ajọ njọ akwa n'ime ya. Ndị anyị naarịa mbụ na ndị anyị na anaghị arịa mbụ Nke ọ lụlụ n'ime ha bụ n'ezie ọ biri na jao cha Ichere n'ọgwụ sigo Ewu! Chimo Agam i enye gị aza m a ka n'e sim ole Agakodu g le gharo le? Ọnwụ ike, Ọnwụ ike nkamgo! Ọnwụ akwadoghị akwado, Ọnwụ a yagi inya nwụọ Ọnwụ mberede, Ọnwụ mberede jurebe nile Ụmụaka naanwụ jurebe nile Ukagwụla nụ iya! Ukagwụla nụ iya! Okenye naanwụ, Agbọghọ na anwụ eeh! Chukwu ị nọkwaya? Kedu i si ya? Chukwu ị nọkwaya? Ukagwụla nụ iya! Ahe!! Chukwu ị nọkwaya? ụmụnnem anyị tọrọtọ Ụmụwa jiri nwayọ K'ofe lola lozuola nyi nri Ewo! cheta kwa Ewa ọ nagwụg gwụ Ewo! cheta kwa Ewa bụ olili Ihe n'eme nyi sikwa nyi rị ka nwanne mo Anyị akpọtụgo iwe Chineke site n'omume anyị Anyị kpatara nparam O! Tambadam, O! Tarabadam, Pam param, Param Teerem, Terem, Tururum, Tururum, Tidibedi, Terrem Kughuhu, Ngwere puku uta nyiolili Unu ahụgo na ok'ọchịchị ọjọọ ku juru wa niile Ndị ananne were nwanne ya gwọrọ ọgwụ k'ọ pare go Agwọ n'elo gi be ya eluwa unu ahụlanụ Nwannem kedu kwanu maka ndị oji egbe aga Onye nwe iche n'ayọ gi biko ebe ọ makpu n'ala Kedu kwanu maka okwoko ee Nwanne amaghị kwa nwanne ya n'elu wa Ụmụ okoro n'ụmụ agbọghọ ji y'emeribe ha ọji Awa nyi nọ na di amaghị na ya nọ na di Ukagwụla nụ o, Ukagwụla nụ ewo Nigeria ndo Ha chinyel'anyị ajụ n'anya Kedu kwanu maka ndị ke ọchịchị dị n'aka? Ha chinyel'anyị ajụ n'anya Ha chinyel'anyị asị ab'ọkpu Ndị nọ n'isi n'azọg kpa ha, ndị nọ n'ọdụ n'azọg kpa ha Ndị ọgalanya n'eri jua fọ, Ụmụ ogbenye nahụ ahụhụ Nigeria chegharia, Ihe gaadịr'anyị mma Ọ bụrụ n'anyị a gaghị echela chakwa ee Ọ bụrụ n'anyị mu t'eziokwu ewo Ihe gaadịr'anyị mma K'anyị cheta n'e qob um gbolo gwun do Wa nọ doo, Sọpụrụ isia wo ndị beg nyi o K'anyị cheta n'ọchịchị si n'aka Chukwu were bịa Akwụkwọ Nsọ kwuru Hụ mmadụ ibe gị n'anya k'i si hụ onwe gị K'anyị hụri t'onwe anyị n'anya, Ụmụnnem maka Chukwu Ewo biko ụmụnnem unu anụgo cheghazianụ o Ụmụnnem ihe gaadịrị, ihe gaadịrị, ihe gaadịrị mma O! Nigeria chegharia ihe gaadịr'anyị nma

Download the sheet music

Uwa Mmebi

Uwa Mmebi

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
5 pages
35 Downloads
Lenten Hymns Prayer
0 0

More lyrics you may want