Full Lyrics
REFRAIN
Onyenweanyị meenu k'm uche Gị bu n'ime m,
Ka agụụ ị m'uche Gị chuwe m'ụra,
Ka m'uche Gị nyewe m afọ ojuju.
VERSE 1
Ngozi dị elu naagba k'okirikiri n'ezie,
Amara zuru oke n'awa kiyi,
na ndụ ha bụ ndị naanabata uche Chineke.
VERSE 2
Jesu, Virgin Maria na ndị nsọ nile,
mer'uche Nna ha hụjuru anya,
mana ha nọzi n'otito ugbu a Nna mee,
K'anyị si n'ahụhụ mezuche Gị wee ket'añụrị,
añụrị dị ebighebi.
VERSE 3
Uche Chukwu, uche Chukwu, uche Chukwu,
Ka ndị mụọma mer'uche Gị O! Chineke,
na ndị nsọ mer'uche Gị nọruba anyị okirikiri,
m'ọbụ ebili ekuwa jiatụa anyị.
VERSE 4
Jesu, Onye nri Ya bụ m'uche Nna,
riọtara anyị ngozi ime na ịnabata uche Nna,
Ka n'ahụhụ Ka n'añụrị.