Full Lyrics
T'ọnụ Jah! Mba niile tọnụ Jah,
tọnụ Jah! Mba niile, tọnụ Jah!
N'ihi na ọ dị mma, o kwesịrị otuto;
k'anyị bulie nụ aha ya elu.
Were obi gị tegharịkwa egwu ọṅụ,
n'ihi na ọ dị mma.
Were une n'ụbọ akwara,
n'opi ike, na olu ụnụ,
tobe nụ Jehova onyenwe anyị,
onye amara nye mmadụ dum,
kpọọ isiala nye Eze anyị,
bụkuo nụ ya abụ otuto;
sọpụrụ ya, gọzikwa ya,
mba niile tọnụ Jehova!