Full Lyrics
SOM TOO CHUKWUINTRODUCTION
Kedi'hem g'enye Gị Chineke Ọzamanma zuru ahụ?
Kedi'hem gaemere Chineke odogwu n'agha?
Ọ bụ onye ga kọchasi nmeso ọma Chineke
Naanị abụ ọma ka anyị ji bịa n'iru Gị Chineke
Abụ otito ka anyị ji bịa ezi Chukwu.
SOM TOO CHUKWUTUTTI
Soro m n'eto Ya, n'eto Ya n'ọdị nma
Soro m tobe Nna, tobe Nna, mkpur'obim tobe Chukwu
Tobe Nna tobe Nna, tobe Nna mkpur'obim tobe Chukwu!
Eh! Ọnaza mo n'aza m'elegh'anya n'azụ
N'ime mkpa m kam bekuru Gị
Okw'izara mo Chineke Onye dika Gị
Ezigwe O abụ otito kam g'eji wee kele Gị Chukwu Nna mo
Abụ otito kam g'eji jaa Gị Nna,
Oh tobe Nna tobe Nna mkpur'obim tobe Chukwu
Tobe Nna, tobe Nna mkpur'obim tobe Nna
Oh tobe Nna tobe Onye dị ukwu.
SOM TOO CHUKWUSECTION 3
Aga m'eji ubọ wee kporo Chineke m'egwu, wee kelee Ya n'ih'ọma o meere m
Aga m'eji ubọ wee kelee Dinwenu
Aga m'eji ubọ wee kporo Ya b'ụdị ụto
Aga m'eji ubọ wee kporo Chineke m'egwu, wee kelee Ya n'ih'ọma o meere m
Aga m'eji ubọ wee kelee Dinwenu
Aga m'eji ubọ wee kporo Ya b'ụdị ụto
SOM TOO CHUKWUSECTION 4
Ihe o meere mo,
Ọnụ m'apụgh'ịkọcha.
Ihe o meere mo,
Ọnụ m'apụgh'ịkọcha.
Ndụ nk'onyere mo,
Ọnụ m'apụgh'ịkọcha.
Ihe o meere mo,
Ọnụ m'apụgh'ịkọcha.
NARA OTITOREFRAIN
Chukwu biko nara otito nke ụmụ Gị n'ebunye Gị.
Onye ọma, Onye ọma Chukwu,
Nara otito nk'ụmụ Gị n'ebunye Gị, Eze.
NARA OTITOVERSE 1
Anyị kelenụ Chukwu keri ụwa Onye obi ọma
Anyị ekele Gị Chineke dị nma
Otito nile n'adịrị Chineke Onye keri ụwa chọọ Ya nma
Chukwu Okike anyị ekele na Gị Nna nara otito.
NARA OTITOVERSE 2
Irem g'eto Chukwu, Olum g'eto Chukwu
Obim g'eto Chukwu keri ụwa
Olisa I meka
Ihe I meere m Chineke O di m'obi ụto
Anyam g'eto Chukwu ntịm g'eto Chukwu
Akam gakporo Chineke ụbọ, ụbọ ụbọ.