Full Lyrics
[SOM TOO CHUKWUINTRODUCTION]
Ked' ihem g'enye Gị Chineke Ọmanmanma zura ahụ?
Ked' ihem gaemere Chineke Odogwu n'agha?
Ọ bụ onye gaakọchasi nmeso ọma Chineke?
N'arụbi ọma k'anyi ji bịa n'iru Gị Chineke,
Abụ otito k'anyi ji bịa ezi Chukwu.
[SOM TOO CHUKWUCHORUS]
Soro m n'eto Ya, n'eto Ya n'ọdị nma
Soro m tobe Ya n'ọdị nma Chineke mo
Eze bube n'ịdị nma
Aga m akọ ihe Chukwu meere mo n'ọdị egwu,
Ị hụrụ m n'anya Chineke karịcha
Mgbe nile m bekuru Gị ị n'aza m
Elegh' anya n'azụ nime mkpa m kam bekuru Gị
Ọkw' ịzara mo Chineke Onye dịka Gị
Ez' igwe, O abụ otito kam g'eji wee kele Gị Chukwu Nna mo
Abụ otito kam g'eji jaa Gị to kam ji ekele Gị
O abụ otito kam g'eji wee to O Chineke n'ịdị nma
Ebube Gị dị ukwu.
[SOM TOO CHUKWUVERSE 1]
Aga m eji ụbọ wee kpọrọ Chineke m egwu,
Wee kelee Ya n'ih' ọma o meere m
Aga m eji ụbọ wee kelee Dinwenu
Maka ih' ọma o meere m
Aga m eji ụbọ wee kpọrọ Chineke m egwu,
Wee kelee Ya n'ih' ọma o meere m
Aga m eji ụbọ wee kelee Dinwenu
Maka ih' ọma o meere m.
[SOM TOO CHUKWUVERSE 2]
Ihe o meere mo, Ihe o meere mo
Onye k'anyi n'ụwa Chineke Nna mo ji eletanu m anya eeh
Tobe Chineke Nna.
[SOM TOO CHUKWUVERSE 3]
Amar' o nyere mo, Amar' o nyere mo
Kọwa kọwa kọwa kọwa nmeso ọma
Amara Ya dịka ok' osimiri
O Chineke mo, Ọnụ m apụghị ịkọcha.
[SOM TOO CHUKWUVERSE 4]
Ndụ nk' o nyere mo, Ndụ nk' o nyere mo
Ndị dị ndụ, ndị dị ndụ gaeja Gị nma
Ndị dị ndụ gaebunye nu Gị otito.
[SOM TOO CHUKWUVERSE 5]
Ọnụ m apụghị ịkọcha, Ọnụ m apụghị ịkọcha
Tobe Chineke Nna
Ọ bụ nwa o nyere mo
Nwa nmem soro m too Chukwu mo.
[SOM TOO CHUKWUVERSE 6]
Ihe o n'emeere mo
Ya n'ọdị m egwu, Ya n'ọdị m egwu
Ọnụ m apụghị ịkọcha, Ọnụ m apụghị ịkọcha
O soro m tobe.
[NARA OTITOCHORUS]
Nze Chukwu nara otito nke ụmụ Gị n'ebunye Gị, Eze.
K'anyi kelenu Chukwu ker' ụwa Onye obi ọma
Anyi g'ekele Gị Chineke dị nma
Onye ker' ụwa chọọ Ya nma.
[NARA OTITOVERSE 1]
Irem g'eto Chukwu, Olum g'eto Chukwu
Obim g'eto Chukwu ker' ụwa.
[NARA OTITOVERSE 2]
Olisa ị meka
Ihe ị n'emeere m Chineke
Ọ dị m n'obi ụtọ.
[NARA OTITOVERSE 3]
Anyam g'eto Chukwu, Ntim g'eto Chukwu
Akam gaakpọrọ Chineke ụbọ, ụbọ ụbọ.