Full Lyrics
REFRAIN
Sọ otu ihe ka m naarịọ n'aka Gịnwenụ
Ka m biri, ka m biri
N'ụlọ nke Gịnwenụ na mbọsị ndụ m niile.
VERSE 1
Gịnwenụ bụ ìhè m na nzọpụta m
Onye ka m gaatụ egwu?
Gịnwenụ bụ ebe mgbaba m
Onye g'eyi m egwu?
VERSE 2
Ọ g'ezobe m n'ebe obibi Ya na mbọsị ọgbaghara
Ọ g'ezobe m n'ime mkpukpu Ya
Kwubasie m ike na nkume bụ Gịnwenụ.
VERSE 3
A ga m ewere obi aṅụrị naachụ aja n'ụlọ Gịnwenụ
A ga m ekw'ukwe aṅụrị nye Gịnwenụ.
VERSE 4
Otito dịrị Nna na Nwa
Na Mmụọ Nsọ n'ụwa tọwa niile.