Full Lyrics
SO OTU IHE KA M NAARỊỌ
REFRAIN
So otu ihe ka m naarịọ n'aka Gị nwenụ
ka m biri ka m biri n'ụlọ nke Gị nwenụ
na mbọsị ndụm niile
Dinwenụ bụ ikem na nzọpụta m
onye kam g'atụ egwu
Dinwenụ bụ ebe mgbaba m
onye g'eyi m egwu
VERSE 2
Ọ g'ezobe m n'ebe obibi Ya
na mbọsị ọgbaghara
Ọ g'ezobe m n'ime mkpụkpụ Ya
kwubasie m ike
ma nkume bụ Dinwenụ
VERSE 3
A gam ewere obi aṅụrị
na achụ aja n'ụlọ Dinwenụ
a ga m ekwu kwe aṅụrị
nye Dinwenụ
VERSE 4
Otito dịrị Nna na Nwa
na Mmụọ Nsọ
Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
n'ụwa t'ụwa niile
CHETA M ONYE NWE M
VERSE 1
Cheta m Onye nwe m
Achụpụna nw'odibo Gị
Cheta m Onye nwe m
Chukwu Nna m oo
Cheta m Onye nwe m
cheta m Onye jiri maka ya taa ahụhụ
Cheta
VERSE 2
Cheta m Onye nwe m
Amara Gị ula kee Gị a ebu n'ili m
Cheta m Onye nwe m
Onye Ịhụrụ n'anya m'ekwele kam laa n'iyi
VERSE 3
Lee obe Kalvary
ebe akpọgburu Dinwenụ
Lee obe Kalvary
VERSE 4
Cheta ebere Gị
Oh Dinwenụ
Cheta ebere Gị
Chukwu Nna m o